BLOODY CIVILIAN

As a kid toro mgbe ọdi very easy ịpụta one morning fu ka ndi yicha akwa ndi army bucha egbe nọchicha main road atu order, I think I can say na one of the worst feelings bụ the fear and absolute helplessness this sight kwesiri inye an assurance of security na-enye. The tension dị very horrible! Onye makwa nke mmadu ga-eme now things aturnụọ to “you! Bloody civilian! Get down! Fifty frog jumps!” Another angle of this general fear bu knowing that our parents, the only superheroes we knew and had adịrọ immune to this tension, this fear, one two one two, ha na onwe ha bụzi kwụ bloody civilians. One two one two ha na enyezi one small boy fifty nwawọ jumps just because na oyi akwa ndi army buru egbe. The whole thing di messed up makachi!
So since taa bu democracy day, bottle beer anuwa m na akwatu na-agara bloody civilians,freedom na civilian rule otu ọbụna ọdina. M ga aṅụ ya as a prayer to osebruwa bearing in mind na ọ ga-adicha mma some day.
E jikwa mụ today ecelebrate ndi nine nugoro ọgụ through mgbọ ọbụna ha gbara ihu na democray,ọchịchị onye kwuo uche ya ruru anyi aka. Ndi force na akwado freedom by ifight tyranny na injustice na ndi bloody civilians na adịrọ atụ ụjọ ihe ga-eme ha if ever they were to open their mouths for freedom at any point. Unu bụ our heroes.
Ọzọ m chọrọ ka onye ọbụna buru n'obi bụ na anyi ncha, ma ndi home ma ndi abroad kwesiri ibu at the back of our minds na injustice to ofu onye bụ injustice to everyone else according to Martin Luther. Anurum na currently a pogrom na-etake place na southern Kaduna. Anyi ncha nuru maka Derek Chauvin, the criminal bloodthirsty police officer gbara George Floyd tọgbọ ka ọkụkọ just because na ọ bụ a black. Agha di. And agha a diri mụ na gi. Agha a bụ against tyranny of all kind, agha a bụ against supremacy of any sects and peoples, ọ against anything and anyone na achọrọ ka uwa a buru a free place where people can freely be. Cheta, democracy abụrọ anything without freedom, especially freedom to be and freedom of speech.
Whatever you’re doing, ina ecelebrate na your chances of being labeled a bloody civilian and shot into an early grave like na ịmatterọ, ka ị na-amourn our dead(George Floyd,the martyrs of the Kaduna pogrom,ndi nwụrụ na biafran war,etc),buru na obi na agha di and agha a diri mụ na gi. Mee ihe ndi inwe ime,humming or singing along to egwu a and be rest assured na m na agụ ya with you.
Agha diri mụ na gi
Agha,agha diri mụ na gi…

Comments

  1. Awwww😩. Quite touching and entertaining all at once. Thanks for writing this beautiful creation.

    ReplyDelete
    Replies
    1. Thanks for reading it, I'm glad you liked it

      Delete
  2. Ịhe a Ị dere jere bụ something I would have read through and replied "nice piece" because n'eziokwu, ọ bụ great work of art. Mana ka anyị gwa onwe anyị eziokwu; agha a dịịrị mụ na anyị, ọ dị gị ka ọ ga-endị anytime soon?

    ReplyDelete
    Replies
    1. Ọbụ eziokwu na ya bụ agha eteela aka odibara, ọ dịkwaghị ka ọ ga endi soon, mana ndị be anyị si na Ositadimma odibara gboo. Oke na ọrụ dịrị everyone of us bụ to make our sphere of influence better, bido na our personality, makana ọbụ ofu aka ruta mmanụ ozuo aka niile.

      Delete
  3. Fantabulous. Amaghị m na Engli-igbo ga atọ ụdịrị ụtọ ma edee ya ede. Daalu rinne.

    ReplyDelete
  4. Ka Chukwudi si Kwuo, FANTABULOUS.

    ReplyDelete

Post a Comment

Popular Posts